OZI EKELE
Ana m enye Chukwu Nna, Chukwu Nwa na Chukwu Mụọ Nsọ ekele maka otu ha si duo m ruo na ngwụcha ihe ọmụmụ a, tụmadị mgbe ekwensụ kwadoro ịnara m ndụ n’ike site n’ihe mberede nke okporo ụzọ. Chineke ekweghị ka ajọ izu ya mezue. Ekele dịrị Jesu, Amen.
Ana m ekele ezigbo di m bụ Maazị Adolphus Chukwuma Ewelum na ụmụaka m bụ Obinna, Kosisọchukwu, Chinwekene, Ifeanyịchukwu, Chisom, Chukwuma na Chidalụ bụ ndị ọ na-asọ ụsọ ịhụ na m nwetara nzere Masters ma gụrụ gaba n’ihu. Ka Chineke gozie ha, Amen.
Ana m ekele n’ụzọ pụrụ iche onye ntuzi aka m n’ederede a bụ Ọkm Uju Ụmọ maka ntuzi aka, nkwado nakwa enyemaka n’ụzọ ọbụla n’oge edemede a na-aga n’ihu. Ndị nkuzi m ọzọ m chọrọ ka ekele m gara bụ Ọkm P.N. Ụzọegwu, Ọkm. J.U Akabọgụ na Ọkm Monica Omeje. Ka Chineke gozie unu. Ndị ọzọ bụ ụmụ akwụkwọ ibe m bụ Maazị Cajetan Egbe na Cletus Ugbor, ka Chineke nọnyere unu, Amen.
Ndị ọzọ ekele m na-agara bụ Ọkm Onyemaechi Mba na Ọkn. Innọ Ụzọma Nwadike bụ ndị nkụzi m na ngalaba Lingwuistiks, Igbo na Asụsụ Naijirịa. Ngọzị dịrị Ọkm Onyemaechi Mba. Ya bụ onye gbara m ume ka m dee ederede a n’Igbo.
Echefughị m ụmụnne m bụ ndị na-agba m ume n’ụzọ ọbụla ịhụ na m na-aga n’ihu. Ha bụ Rose, Francis, Josephine, Tonia, Ejima m bụ Patrick, Chikwendu, Chinasa, Sunday an Chịdị. Ka Chineke gọzie ma na-echekwaba unu niile, Amen.
ỤMỊ NCHỌCHA
Ebunuche nchọcha a bụ ịmata mmeta nke ọma n’ụtọasụsụ Igbo n’ule sekọndịrị skuul n’okpuru ọchịchị Nsụka Edukeshọn Zoonu. Ebunuche ihe ọmụmụ a bụ ịchọpụta nsogbu dịrị ụmụ akwụkwọ sekọndịrị skuul mmeta nke ọma n’ụtọasụsụ Igbo n’ule akwụkwọ ha. Ihe onye nchọcha chọpụtara ga-enye aka ime ka ndị nkuzi na ụmụ akwụkwọ nwee mmasị n’ikụzị na ọmụmụ asụsụ Igbo na sekọndịrị skuul na Nsụka Edukeshọn Zoonu tụmadụ na mmeta nke ọma n’ụtọasụsụ n’ule sekọndịrị skuulu. Usoro nchọcha bụ ụlọ akwụkwọ dị n’ime obodo na obodo mepere emepe dị n’okpuru ọchịchị Nsụka. Ọnụ ọgụ ụlọ akwụkwọ ahụ dị iri ise na itoolu. N’ime ụlọ akwụkwọ onye nchọcha weere ụlọ akwụkwọ itoolu ọnụọgụ ha dị narị anọ, iri ise na asatọ wee mee nchọcha. Ụmụ akwụkwọ ahụ na-agụ sịnịọ sekọndịrị skuulu II. Usoro nchọcha ihe ọmụmụ a bụ ntụcha nke e ji pesenteeji wee mee. Rizọọlt na-egosi na:
- ụmụ akwụkwọ enweghị mmasị n’asụsụ epum ha.
- e nweghị ndị nkụzi azụrụ nke ọma n’akụzi asụsụ Igbo n’ụlọ akwụkwọ sekọndịrị skuul
(ch) ndị nkụzi gụrụ maka asụsụ Igbo ji Bekee akọwa Igbo.
(d) ndị nkụzi anaghị aga ọgbakọ, nchọcha, njem nlere anya mara ngbanwo dị n’asụsụ Igbo ma kuziere ha ya ụmụ akwụkwọ
Onye nchọcha nyere atụmatụ ọma ga-enye aka ime ka asụsụ Igbo bụrụ akwaa akwụrụ n’ebe ụmụ akwụkwọ Igbo nọ. Ọ sị na a ga-ebido n’akwụkwọ ọtaakara kuzibere ụmụ akwụkwọ asụsụ Igbo na Bekee ga na-abịa mgbe ọ bụ Bekee ka a ga-akụzi. Onye isi ụlọ akwụkwọ ga-amapụta atụmatụ maka ọgbakọ, nchọcha, nlere anya maka ndị nkụzi na ụmụ akwụkwọ. Nke a ga-enye ha obi siri ike na o nweghị asụsụ ka ibe ya. Ndị nne na nna ga-enye aka sụbara ụmụaka ha asụsụ Igbo n’ụlọ. Mgbe a gbasoro usoro ndị a, a mara na asụsụ Igbo ga-abụ akwaa akwụrụ.
https://www.modishproject.com/download-complete-project-topics-and-materials/
Leave a Reply
You must be logged in to post a comment.